Ọtụtụ akụkọ na soshal midia ekwuola na ịṅụ mmiri ọ́krà na-akwalite afọ ime nwanyị.
Mmiri ọ́krà, dịka ihe mbipụta ndịa kwuru, bụ akwụkwọ nni eberisiri, bànyé n’ime mmiri.
Akwụkwọ nni à nke na-alọ alọ bụ̀ nni amara ofụma na mba Afrịka, ọkachasị n’ụfọdụ obodo dị n’odịda anyanwụ na Central Afrịka.
Ewezuga na á na-eri ya dịka nni, ọtụtụ ndị mmadụ na soshal midia ekwuola na enwere ike íji ya akwalite ịtụrụ ime.
Advertisement
N’otu ihe ngosị e biputara na Facebook, ótù nwanyị dị ime egosila òtú ó sì emepụta nya bụ mmiri ọ́krà maka “ịmụ nwa dị mfe” ya na “ọmụmụ nwa nke ejighi enyemaka ọgwụ oyibo”.
N’ime ihe ngosị ahụ, nwanyị ahụ bewara ọkra n’ime ìkó mmiri dịgasị n’ihu ya, jiri àkpà mechie ọnụ ya, ma sị ka echekwaba ya n’ime ńgwá njụ oyi ótù ụbọchị. Ó mechara gụpụta ọ́krà ndị a n’ime mmiri, mà tinye ihe na-atọ ka mkpụrụ osịsị n’ime nta bụ mmiri.
“Ụmụ nwanyị, ekele m ụnụ. A hụrụ m ihe a, nke e kwuru na ọ na-enye aka ịkwalite ịtụrụ ime n’ụmụnwanyị nke ndị na-achọ nwa. Atụmatụ m na-enye ụmụnwanyị bụ kà há nwalee ya,” bụ ihe ótù mbipụta na Facebook kwuru.
Advertisement
Izaghachi mbipụta a, ótù onye na Facebook kwuru: “Ee, ọbụ ụzọ esi akwalite ịtụ ime n’ejighi ọgwụ ndị bekee. Ọ dị mma nyere nwanyị ọbụla chọrọ ịmụ nwa.”
Ọ́ gara n’ihu kwuo na “ona-akwalite ịtụ ime”, gbakwunye na “ọ dị nma iṅu ya ụtụtụ ọbụla site na ụbọchị mbụ nsọ nwanyị kwụsịrị”.
Ihe ngosị a enwetala nkiri ruru narị itoolu na iri anọ n’anọ, nkwado iri ise n’itoolu, Ntụnye ọnụ itoolu. Mbipụta nke abụọ bụ nke pụtara n’asafe ọtụtụ ndị mmadụ ruru puku narị anọ na iri abụọ n’asaa nọ n’ime ya. Mbipụta a enwetala ntụnye ọnụ narị anọ n’iri n’otu, ya na nkesa itoolu.
ŃSÓ NWÁNYỊ̀ NÀ Ị́TỤ ÍME
Advertisement
Ńkwádó ịtụ ime bụ mgbe àhụ́ nwanyị zipụrụ àkwá tózùrù òkè site otu akụkụ ákwà mgbe nwanyị n’ahụ ńsọ́ ya.
Ákwá a ga- agba a n’ime akpa nwa site n’ogologo eriri akporo( fallopian tube) nke ga-akwadozị nwayọ maka ịtụ ime. Afọ ime ga aputa ìhè mgbe spam nwoke zutere akwa nke nwayọ.
Mgbe nwayị dị ime, a na-ákwádó ha ịdị n’eri ufodu nnị́ n’enyi protin, iyon, folic acid, iodine, na choline. Ọdịkwa mkpa inweta calshium, vitamin D, potassium na Fibre n’ozuzu ókè.
ŃYÓCHÁ ÓKWÚ À MÀKÀ MMỊ́RỊ́ Ọ́KRÀ
Advertisement
Ịmata ihe ndị mejupụtara ọ́krà, TheCable jụrụ Elizabeth Kembe, onye ọkachamara nke home economics na ụlọakwụkwọ College of Food Science and Human Ecology na mahadum University of Agriculture nke dị na Markurdi na Benue steeti.
Kembe kwuru na ọ́krà bụ akwụkwọ nni nwere ọtụtụ akụrụ ngwa minerals, vitamins nakwa antioxidant, ma gbakwunye na enwebeghị ngosị na ọ na-akwalite mmekọ nwoke na nwanyị.
Advertisement
“Akwụkwọ nni a nwere ụfọdụ ọrụ ha na-arụ. Ụfọdụ dị mma maka ahụ, ụfodu dị mma maka ụ́rá yana mmegharị afọ. Mana ịsị na ọ́krà na-akwalite ịtụ ịme, anụtụbeghị nchọpụta dị ótú ahụ,” Kembe kwuru.
“Anyị ma n’ọbụ akwụkwọ nni nwere ọtụtụ akụrụ ngwa na-akwalite ahụ mmadụ. Mana gbasara ịtụ ime na ọmụmụ nwa, nke a bụzi akụkọ ọzọ n’onwe ya.
Advertisement
Ótù nnyocha e bipụtara na United States National Library of Medicine gosịrị na ọ́krà bụ nni jupụtara n’ọtụtụ akuru ngwa na-edozi ahụ. Iri ya ga-enye onye ahụ otutu ihe dịka dietary fibre, carbohydrates, protin, na minerals, n’ihi mmejupụta ya. Nnyocha a kwụrụ na akwụkwọ nni a nwere ụfọdụ akụrụ ngwa ga-ebeleta ọrịa sugar.
Onweghị mgbe nnyocha jiri kpọtụta ịtụ ime maọbụ ọmụmụ nwa.
Advertisement
Mohammed Bukar, onye ọkachamara obstetrics and gynecology bụ nlekọta ụmụ nwanyị dị ime, na mahadum University of Maiduguri, gwara TheCable na okwu a na ọ́krà na-akwalite ịtụ ime n’ụmụ nwayị bụ nnọọ “ụgha nke sayensị”.
“Onwere ụzọ esi enyocha okwu. Na nghọta nke m, enyochabeghị ókwú à ebe ọbụla,” okwuru.
“Naanị mgbe enwere nnyocha na ya nke sayensị nyochara ọfụma ka mmadụ nwe ike ikwu okwu dị ótú a.”
ŃCHỊ́KỌ́TÁ
Okwu a na ọ́krà na-akwalite ịtụ ime, ya na ịmụ nwa bụ nke enweghị nkwado ọbụla.
Enwebeghị ihe akaebe sayensị kwadoro nya bụ okwu. Ndị ọkachamara kwuru sị́ na nwanyị ọbụla kwesịrị ịchọ enyemaka dọkịta mgbe ọ dị ịme.
Add a comment