--Advertisement--

Bello el-Rufai tụ̀rụ̀ àsị́, Hadiza Balarabe ábụghị nwányị̀ ìzìzì á họpụ̀tàrà dị́kà òsòté gọ́vanọ̀

Bello el-Rufai, onye omeịwụ na-anọchịte ndị Kaduna north, ekwuola na Hadiza Balarabe bụ nwanyị izizi ịbụ osote gọvanọ na Naijiria.

Onye omeiwu à kwuru nke a na pọdkastị onye nta akụkọ Seun Okinbaloye hibere.

Pọdkastị a nwere ndị nsonye puku iri na isii na narị atọ (16.3k), nkiri puku iri itoolu n’anọ na narị asaa n’iri isii (94,760), ntụnye ọnụ narị isii n’abụọ (602), na nkwenye puku abụọ na narị itoolu (2.9k).

Bello bụ nwa Nasir el-Rufai, onye bụbu gọvanọ Kaduna steeti.

Advertisement

N’afọ 2018, Nasir el-Rufai họpụtara Balarabe dịka osote ya na ntuliaka ọkwa gọvanọ Kaduna nke afọ 2019.

O kwuru na mkpebi ịhọrọ Balarabe bụ maka na Barnabas Bantex, osote ya, gwara ya maka mkpebi ya ịzọ ọkwa sịnatọ.

Tupu à họrọ ya dịka onye osote el-Rufai, Balarabe bụ onye isi odeakwụkwọ nà Kaduna State Primary Health Care Development Agency.

Advertisement

ŃNYÒCHÁ

N’okwu ọrụ nna ya, onye omeiwu Bello El-Rufai kwuru na nna ya, site n’aka Balarabe, gwọgharịrị ụlọ ahụike narị abụọ na iri ise n’ise (255) niile dị na Kaduna.

“N’ihu ọma, ótù n’ime ọrụ nna m na osote ya bụ Hadiza Balarabe, onye nke bụ nwanyị izizi ịbụ osote gọvanọ na Naijiria, bụ ịrụgharị ụlọ ahụike narị abụọ na iri ise n’ise (255) niile dị na Kaduna,” onye omeiwu a kwuru.

K’osiladị nnyocha TheCable mere gosịrị na, kamgbe afọ 1999 ọchịchị onye kwuo uche ya lọghachitara, Naijiria enwela ọtụtụ osote gọvanọ bụ nwanyị n’ọtụtụ steeti.

Advertisement

Ụ́MỤ̀ NWÁNYỊ̀ ŃDỊ́ Á HỌPỤ̀TÀGÒRÒ DỊ́KÀ ÒSÒTÉ GỌ́VANỌ̀ NÀ NAIJIRIA

Lagos bụ steeti izizi ịhọpụta nwanyị dịka osote gọvanọ. N’afọ 1992, oge enwere obere ọchịchị onye kwuo uche ya, a họpụtara Micheal Otedola dịka gọvanọ Lagos, n’okpuru òtù National Republic Convention (NRC), ebe Sinatu Ojikutu bịara bụrụ osote ya.

Ojikutu chịrị dịka osote gọvanọ ruo ọnwa Novemba nke afọ 1993 mgbe ndị agha naghara ọchịchị.

N’afo 1999, Naijiria laghachiri na ọchịchị onye kwuo uche ya. Bola Tinubu meriri na ntuliaka ọkwa gọvanọ n’okpụrụ òtù Alliance for Democracy (AD), ebe ọ họpụtara Kofoworola Akerele-Bucknor dịka osote ya.

Advertisement

Site n’oge ahụ, ụmụ nwanyị ndị dịka Adebisi Sosan, Adejoke Orelope-Adefulire, na Oluranti Adebule gara n’ihu ịchị dịka osote gọvanọ a họpụtara site n’afọ 2007 ruo afọ 2019.

Ayo Fayose họpụtara Abiodun Olujimi dịka nwanyị izizi ịbụ osote gọvanọ na Ekiti steeti site n’ọnwa Septemba nke afọ 2005 ruo 2006. Kayode Fayemi mere Funmilayo Olayinka osote ya site n’afọ 2010 ruo afọ 2013 tupu ọ nwụọ, ebe Modupe Adelabu bịara bụrụ osote gọvanọ na ọnwa May nke afọ 2013.

Advertisement

Na Ogun steeti, Salimat Badru bụ osote gọvanọ site n’afọ 2003 ruo 2011, ebe Yetunde Onanuga bụ osote gọvanọ site n’afọ 2015 ruo afọ 2019.

Na Osun, Olusola Obada bụ osote gọvanọ site n’afọ 2003 ruo afọ 2010, n’okpuru ọchịchị Olagunsoye Oyinlola, ebe Titilayo Laoye-Tomori bịara bụrụ osote gọvanọ n’afọ 2010 ruo 2018.

Advertisement

Pauline Tallen bụ osote gọvanọ Plateau steeti n’afọ 2017, ma bụrụkwa nwayị izizi ịbụ osote gọvanọ na mpaghara ugwu nke Naijiria, ebe Nyesom Wike mere Ipalibo Banigo osote ya na Rivers steeti, site n’afọ 2015 ruo 2023.

Cecilia Ezeilo bụ osote Ifeanyi Ugwuanyi mgbe Ugwuanyi merichara dịka gọvanọ steeti Enugu n’afọ 2015.

Advertisement

A họpụtara Noimot Salako-Oyedele dịka osote Dapo Abiodun nke Ogun steeti n’afọ 2019, n’otu afọ ahụ Balarabe batara ọchịchị dịka osote gọvanọ na Kaduna.

N’afọ 2022, Uba Sani họpụtara Balarabe dika osote ya na ntuliaka e mere na steeti ahụ. N’ọnwa March nke afọ 2023, Balarabe mechara bụrụkwa osote gọvanọ steeti ahụ.

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Okwu Bello el-Rufai na Balarabe bụ nwanyị izizi ịbụ osote gọvanọ na Niajira bụ asị.

Sinatu Ojikutu bụ nwanyị izizi a họpụtara dịka osote gọvanọ na Naijiria

Add a comment

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

error: Content is protected from copying.