--Advertisement--
Advertisement

Íbuụzọ̀ àwụ́sá ḿmíri n’ísí m̀gbè ḿmádụ̀ nà-àsá àhụ́ ọ̀ nà-èbúté ọ́rị̀à stroke?

‘I don’t smell’ — Chemist who stopped bathing 15 years ago explains why ‘I don’t smell’ — Chemist who stopped bathing 15 years ago explains why
‘I don’t smell’ — Chemist who stopped bathing 15 years ago explains why

Edemede á hụtara nà ịntanetị na-akọwa nà ọ̀tụ́tụ́ mmadụ na-enwe nkpọnwụ ahụ, nke ndị bèkéè na-akpọ stroke, ébé há nà-àsá ahụ maka nà há bù ụzọ wụ́sá mmiri n’isi.

Edemede a kwuru na usoro a na-eme kà ọbara gaa n’isi ngwa-ngwa, nke nwere ike ịgbawa ákwárà.

“Dịka ọtụtụ nnyocha sayensị n’ụwa niile kwuru, ọnụ ọgụgụ ọnwụ mmadụ maọbụ nkpọnwụ akụkụ ahụ mgbe á nà-àsá ahụ na-arị kà ụbọchị na-aga. Dịka ndị dibịa oyibo kwuru, e kwesiri kà e soro ụfọdụ usoro dịka anyị na-asa ahụ,” edemede ahụ kwuru.

“Ọbụrụ na ịsoghị ézí usoro dịka ị nà-àsá ahụ, ị nwere ike ịnwụkwa.”

Advertisement

Edemede à gbakwunyere nà ndị dọkịta nyere ndụmọdụ megịde ibu ụzọ àwụ́sá mmiri n’isi m̀gbè mmadụ na-àsá ahụ, maka n’onwere ike iweli òtú ọ̀bàrà sì aga n’akụkụ ahụ, nke nwere ike iweli ikike ńkpọ́nwụ́ ahụ stroke, ọkachasị màkà ndị nwere ọbara mgbali elu, oke choloestorel, maọbụ isiọwụwa.

Edemede áhụ̀ kwuru kà á na-asa ahụ site n’ịbịanye ụ́kwụ́ na mmiri, ma jiri nwayọ sárá gbagowezie elu, ma werezie nwayọ wụsa mmiri n’isi.

Nnyocha TheCable mèrè kpughere na edemede ahụ bụ nke ekegoro kamgbe 2019, mgbe Mohammad Ulah, onye ji Facebook ezịsa ọzị, biputara ya n’asafe nke ya.

Advertisement

Onye ọzokwa zipu ótù ozi à nà ịntanetị n’afọ 2020, nke nwetara ihe karịrị mmasị narị atọ, nkesa ótù narị nà iri asaa, ya na ntụnye ọnụ iri isii n’ise.

N’otu aka ahụ, n’áfọ̀ 2021 na 2022, edemede a bụ nke ekesara ọtụtụ ugboro.

N’izu ụka gara aga, edemede à bụ nke á bịara hụta ọzọ na ịntanetị n’okwu kwa okwu. Nya bụ edemede jìkwà ótù ihe ngosi gbásà.

ÍHÉ NA-EBUTE Ọ́RÌÀ STROKE

Advertisement

Ụlọrụ màkà njikwa ọrịa ná ḿbà US bụ Centre for Disease Control (CDC) kọwara nà nkpọnwụ ahụ na-eme m̀gbè enwere mgbochi ná ngazu ọbara n’ụfọdụ akụkụ ụ̀bụ́rụ̀, maọbụ mgbe ákwárà ná-eziga ọbara n’ụbụrụ gbapuru. Mgbe nke à mere, ụfọdụ akụkụ ụbụrụ ga-enwe nsogbu, nkwarụ oge tere áká, maobu búté ọnwụ.

TheCable gara n’ọba ozi nke otu di iche iche na-eneba anya màkà ahụike mmadụ. Nke a gụnyere ọba ozi National Health Service nke mba UK, Mayo Clinic, nà John Hopkins Medicine. Ebumnuche nnyocha a bụ ịchọpụta ihe na-akpata nkpọnwụ akụkụ ahụ.

Mànà onweghị nke kwuru nà esoghị nya bụ usoro eji asa ahụ na-akpata nkpọnwụ akụkụ ahụ.

‘ÒNWÉGHỊ ÍHÉ JIKỌTARA STROKE NÀ ÚSÒRÒ Ị́SA ÀHỤ́’

Advertisement

Omojowolo Olubunmi, onye ọkachamara na-ahụ màkà nkpọnwụ ahụ ma bụrụkwa dọkịta na-ahụ màkà ụ̀bụ́rụ̀ nà UK, gwara TheCable na edemede ahụ abụghị eziokwu.

Ọ kọwara nà ịwụ mmiri n’isi na-emetụta sọsọ ákwárà isi ndị nọpụtara-anọpụta, nke na-eme kà há kpákọ́ọ́ maọbụ méghéé site nà ọkpọmọkụ nya bụ mmiri.

Advertisement

 

“Ákwárà ndị nọpụtara-anọpụta anaghị akpata stroke. Ndị na-akpata stroke bụ ndị nọbara n’ime ụbụrụ. Nakwa, mmiri anaghị emetụta ha n’ụzọ adịghị mma, nke mere edemede ahụ jiri ghara ịnwe nnyocha sayensị ọ gbadoro ụkwụ nà yá,” ihe à kà o kwuru.

Advertisement

“Mkpọnwụ ahụ anaghị eme òtù ahu. Enwere ihe ndi na-akpata nkpọnwụ ahụ. Onweghị ụzọ usoro ịsa ahụ siri metụta ya. Mà ìsìrì n’isi maọbụ n’ụkwụ saa ahụ, ọ gbanweghị ihe ọbụla.

“Ihe na-ebute stroke bụ nsogbu dịka ọbara mgbalị elu, ọrịa suga, ákwárà ịgbawa, obi ịkụ n’usoro n’adịghị mma. Ọtụtụ nkpọnwụ ahụ na-abụkarị màkà ọbara enweghị ike ịga n’ụbụrụ.”

Advertisement

NCHỊKỌTA

Edemede nke na-ekwu nà ibuụzọ awụsa mmiri n’isi mgbe mmadụ na-asa ahụ nwere ike ibute ḿkpọ́nwụ́ akụkụ ahụ bụ àsị́. Onweghị nnyocha sayensị kwadoro ya.

Add a comment

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

error: Content is protected from copying.