--Advertisement--
Advertisement

Ị́gbọ ńchà ò nà-èmé ụ́mụ̀ nwóke ísí ńkwọ́chá

Ọtụtụ mmadụ na mgbasa ozi ọha kwùrù sị na ụmụ nwoke imetụ onwe ha aka n’amụ bụ ótù ihe na-eme kà ha nwee ísí ńkwọ́chá.

Onye bu ụzọ tinye ókwú a na Twitter bụ ótù onye na-aza Eric (@amerix). Ọ sị na óké ị́gbọ ńchà na-ème ńtùtù ísi ụmụ nwoke ịdapụ.

“Ótụ ihe na-eme kà ụmụ nwoke nwee ísí nkwọcha bụ imetụ ònwé ha aka n’amụ. Óké ị́gbọ ńchà na-eme ka ńrí dị mkpà màkà òtító ńtùtù ísi nwụọ. Mgbe ọbụla ị hụrụ nwoke nwere ńtùtù isi na-ala àzụ́, chetere ya kà ọ kwụsị ị́gbọ ńchà,” nke a bụ ihe Eric dèrè.

Ndị kere okwu a karịrị ótù puku na narị anọ. Ndị ọ màsị̀rị̀ rùrù pụkụ asatọ na narị asatọ.

Advertisement

Na Facebook, ekere ótù mbiputa a ọtụtụ ugboro na akaụntụ dị iche iche. Otu n’ime ha bụ nke Emem Nelson, onye kwuru na ọ bụ dọkịta. Ndị na-eso ya karịrị puku asatọ.

Onye ọzọ na Facebook, Jay Ade, tinyere okwu a na Medriod Elite City, ótù ọha na Facebook nke nwere mmadụ puku itoolu na-eso ya.

ŃCHỌ́PỤ̀TÁ

Advertisement

Akwụkwọ nkọwa okwu, Merriam-Webster Dictionary, kọwara Ị́gbọ ńchà dị ka ị́kpalite agụụ mmekọahụ síté n’imetụ ònwé mmadụ áká, ébé ebumnobi bụ̀ inwete ụtọ aramara.

Dika nkọwa a sìrì kwuo, o nwere ike ísite na mmetu aka ma ọ bụ íji ngwa aramara ma e wezụga mmekọahụ nnwoke na nwayị, ma ọ bụ ngwakọta ihe a niile, ma ọ bụ ihe ndị ọzọ.

TheCable kpọtụrụ ọkachamara ahụ ịchọpụta ma o nwere ụzọ sayensị sì kwàdó okwu nke sị na ị́gbọ ńchà na-eme kà ụmụ nwoke nwee isi ńkwọ́chá.

Best Odinioha, prọfesọ public health & community medicine, sị na ọ bụghị eziokwu.

Advertisement

Ọ sị na isi ńkwọ́chá na ị́gbọ ńchà enweghị mmekọrịta. Ọ sị na onye dere nya bụ okwu na Twitter chọrọ iji ya dọta ndị mmadụ.

O kwukwara na o nwèrè ike iji ya na-eme ka ndị mmadụ tụọ égwù na ihere n’ebe ndị ísí ńkwọ́chá nọ̀.

Odinioha sị na ndị mmadụ nwèrè íké ịhụ nwoke nwere ísí ńkwọ́chá, ma chee na ha na-emetụ onwe ha áká n’amụ.

ÍHÉ NWERE ÍKÉ ÍME ḾMÁDỤ̀ ÍNWE ÍSÍ ŃKWỌ́CHÁ

Advertisement

Francis Agbaraolorunpo, ọkachamara ahụ na Mahadum Lagos, sị na o nwere ihe dị iche iche nwere ike ime kà nwóke nwee ísí ńkwọ́chá, mana ọ bụghị imetụ ámụ̀ áká.

“Ótù ihe na-eweta ísí ńkwọ́chá bụ mkpụrụ ndụ ihe nketa. Mmadụ nwere ike iketa ya site n’aka nne na nna ya”, ihe a kà ó kwùrù.

Advertisement

“Ọ̀zọ́ bụkwa na ndị arụ adịrọ nwere ike ịnwe ísí ńkwọ́chá. Ọrịa ndị bekee na-akpọ alopecia, ma ọ bu cancer, nwekwara ike ime ka ha nwee ísí nkwọcha. Na ụdịrị ọnọdụ a, ụmụ nwaanyị nwere ike ịnwe ísí nkwọcha.”

Ọkachamara kwusiri ike, sị na imetụ aka n’amụ bụ ókwú gbasara uche. Ọ sị na onweghị ihe gbasara ị́gbọ ńchà n’ebe ísí nkwọcha nọ, ma ọ bụ òtú nwoke dị.

Advertisement

Ọ gara n’ihu ikwu na ọ bụrụ na nwoke enweghị oke onwe ya, onwere ike ime ka ọ na emetụ onwe ya aka n’amụ.

“Ị́gbọ ńchà nwere ike ime ka nwoke atunyenwune nwanyị ime. Nwoke na-emetu onwe ya aka n’amu nwere ike ịnwe obere spam ma ya na nwaanyị nwee mmekọ,” ihe a kà ọ kwùrù.

Advertisement

ÍKPÉ

Mgbarakwa na mmadụ imetụ onwe ya aka n’amụ bụ ihe nke mbụ na-eme ka nwoke nwee isi nkwọcha bụ okwu adịgboroja. Dị ka sayensị kwuru, nwoke ị́gbọ ńchà na inwe isi nkwọcha enweghị mmekorita.

Add a comment

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

error: Content is protected from copying.