--Advertisement--

Íhé Atiku kwùrù nà LCCI economic parley àbụ̀ ézíókwu?

Atiku Abubakar Atiku Abubakar

Atiku Abubakar, ónyé bụbu òsòté onye isi ma bụrụkwa ónyé òtù Peoples Democratic Party (PDP) na-azọ ndọrọ ndọrọ ọchịchị, kwùrù ọtụtụ okwu oge ọ na-egosị atụmatụ akụ na ụba ya na mmeme Lagos Chamber of Commerce and Industry (LCCI) mere nso nso à. 

Nya bụ ónyé bụbu òsòté onye isi Nigeria kwùrù ókwú na LCCI private sector economic forum nke há mèrè na 2022.

TheCable nyochara ihe o kwùrù. Nke a bụ ihe anyị chọpụtara.


MGBARAKWA NKE MBỤ: Obodo Naijiria n’okpuru ọchịchị òtù APC (All Progressives Congress) na-eji ụgwọ mgbe niile, kemgbe ha bànyèrè n’ochichi na áfọ̀ 2015.

Advertisement

IKPE: Ọ bụ eziokwu. Kemgbe APC bànyèrè na ọchịchị, obodo Naijiria ji ụgwọ.

Nnyocha TheCable mèrè kpughere na ọchịchị Buhari ji ụgwọ kemgbe ọ banyere na áfọ̀ 2015.

Ótú ọ dị, nke bụ ka akụ na ụba sìrì dị na Nigeria n’okpuru ọchịchị gara aga kemgbe afọ 1981.

Advertisement

Ma ewezụga afọ 1995 na 1996 oge gọọmenti Naijiria kpàtàrà égo karịa òkè o mefùrù, Naijiria nọ na ụkọ ego kemgbe afọ 1981.


MGBARAKWA NKE ABỤỌ: M̀gbè niile Naijiria méfùrù égo karịa nkè ọ kpàtàrà n’okpuru ọchịchị Buhari, ó jì pasentị atọ gáfèé ókè Fiscal Responsibility Act kwètèrè na ya.

IKPE: Ọ bụ eziokwu. Ntule mmefu ego òké Naijiria n’akụkụ akụ na ụba ya jìrì pasentị atọ karịa karịa òkè nkwekọrịta obodo n’afọ 2017, 2019, 2022, na 2021. Nke a mèrè ugboro anọ n’ime afọ asaa.

Year Budget deficit as a percentage of GDP
2010 -2.o2
2011 -1.84
2012 -1.36
2013 -1.4
2014 -0.94
2015 -1.65
2016 -2.63
2017 -3.17
2018 -2.84
2019 -3.41
2020 -3.57
2021 -3.93

Dịka ọ́bá égo ètítì, Central Bank of Nigeria (CBN), na ụlọ ọrụ mmefu ego, Budget Office, sìrì kwuo na mbipụta PricewaterhouseCoopers (PwC) deputara, ọchịchị Buhari bìrì égo karịa pasentị atọ bụ ọnụ nkwekọrịta obodo màkà mmefu ego n’afọ 2017. O dekọtara 3.17%.

Advertisement

Naijiria agafego nkwekọrịta pasentị atọ site n’afọ 2019 ruo 2021, dịka PwC siri kwuo.

Nigeria Fiscal Responsibility Act nke 2007 kwetere na mmefu ego òkè nke karịrị pasentị atọ akụ na ụba, GDP, mà ọgbaghara dị́ na obodo maọbu ma íhé íke megide ọchịchị. Nya bụ ìwú kwùrù nke ǹdò ányá na onye isi obodo nwèrè íké ikpebi ógè nke a ga-eme.

Ikpefan Ochei, prọfesọ finance na mahadum Convenant University, gwara TheCable na obodo Naijiria adaala n’ịdọ aka ná ntị gbasara mmefu ego kemgbe afọ 2015. Ọ sị na ihe kpatara nke a bụ ọnụ ahịa mmanụ na-agbanwe agbanwe mgbe ọbụla.

“Mmanụ ka bụ isi iyi ebe Naijiria sì enwete ego. Ngalaba mmanụ na gas adaala na iri na itoolu n’ime nkeji anọ afọ iri na itoolu niime iri atọ kemgbe afọ 2014. Nkezi nke a bụ $108.56 n’afọ 2013 na $111.63 n’afọ 2012,” nke a bụ ihe ọkachamara ego kwùrù.

Advertisement

“N’ọchịchị onye kwuo uche ya ebe gọọmenti kwesịrị imete atụmanya ndị a, n’agbanyeghị ọnọdụ akụ na ụba obodo, igbazi ego abụghị mpụ ma ọ bụrụ na a ga-eji ya me ihe ziri ezi, ọ bụghị màkà oriri.


MGBARAKWA ATỌ: Nkezi Naijiria enweghị ike i zụrụ isi igwa ahịa. Otu ogbe achịcha ji pasenti narị karịa ego ole a na-azu ya n’afọ 2020.

Advertisement

IKPE: Nke a bụ adịgboroja. Ótù ogbe achịcha agbagola site na pasenti ịrị ise na abụọ maka nke e bere ebe na pasenti ịrị ise na ise maka nke ebeghị ebe. Ọ bụghị pasenti narị dị ka Atiku si kwuo.

Data nke ụlọ ọrụ nchịkọta akụkọ mba, National Bureau of Statistics (NBS), weputara n’ọnwa Julaị n’afọ 2022 zikoro na nkezi ọnụ ahịa achịcha (500g) n’etiti obodo bụ ₦486.27 maka achịcha e bere ebe na ₦447.16 maka achịcha ebeghi ebe.

Advertisement

Ka ọ dị ugbu a, na ọnwa Julia n’afọ 2020, nkeji ọnụ ahịa achịcha nke 500g bụbu ₦318.5 maka nke e bere ebe na ₦287.7 maka nke ebeghị́ ebe.

Ihe dị iche na nkeji ọnụ ahịa achịcha n’etiti ọnwa Julia na afo 2020 na ọnwa Julia na afọ 2022 bu ₦167.7, na-anọchi anya 52.6% màkà nke e bere ebe na ₦159.46 maka nke ebeghị ebe. Nke a jị 55.4% rịa n’ọnụ mbụ ya.

Advertisement

MGBARAKWA NKE ANỌ: Ndị ọrụ ugbo ugbua na-akwụ pasenti narị abụọ maka àkpà fatilaiza karịa ọnụ ahịa ha gòrò ya na 2020.

IKPE: Nke a bụ eziokwu. Ọnụ ahịa fatilaiza a agbagola ruo pasenti narị atọ karịa ọnụ mbụ ya.

Ụdịrị fatilaiza ndị ọrụ ugbo na-ejikarị eme ihe bụ́ NPK na Urea fatilaiz.

N’afọ 2020, gọọmenti etiti belatara ọnụ ahịa 50kg nke NPK 20.10.10 fatilaiza site na puku naịra ise na narị ise ruo puku naira ise n’okpuru Presidential Fertiliser Initiative (PFI).

E lere Urea fatilaiza na nkeji ọnụ ahịa nke puku naira iri na isii na narị ise na ọnwa Maachi na afọ 2022, mgbe nkeji ọnụ ahịa NPK 20:10:10 bụ puku naịra iri na ise na narị anọ. Mgbe ahụ NPK 15:15:15 pụtara puku naira iri na isii na narị ise.

Ị tulee ọnụ ego enyemaka nke fataliza bụ puku naira ise n’afọ 2020 na nkeji ọnụ ahịa NPK fatilaiza na afọ Maachị 2022, o zikọrọ ọrịrị pụtara pasenti narị abụọ na iri atọ.

Ọnwa ise gáfèé oge IFDC bipụtara ọnụ ọgụgụ ndị a, Gideon Nagedu, odeakwụkwọ ukwu nke Fertiliser Producers and Suppliers Association of Nigeria (FEPSAN), kwetere na ọnụ ahịa fatilaiza gbagoro ruo pasenti nari atọ n’obodo.

“Nke a bụ izizi ọ na agbago ruo pasenti narị atọ. Ọ mebeghị mbụ. Ọ bụ maka ị gaghị ahụdị ya anya. Nke a mèrè n’ụwa nile. Ọ bụghị sọ na Nigeria. Nke bụ nsogbu,” ihe bụ ihe o kwuru.

Gọọmenti Naijiria tinyere ụta maka orịrị ọnụ ahịa fatilaiza na ọgu ndị Russia na Ukraine na-anụ.


MGBARAKWA NKE ISE: Ọnụ ọgụgụ ndị ntorobịa adịghị arụ ọrụ ji nde itoolu gbago, site na nde anọ na afọ 2015 banye nde iri na atọ na 2020.

IKPE: Okwu a bụ eziokwu. Okwu Atiku kwụrụ maka mgbago ọnụ ọgụgụ ndị ntorobịa na Naijiria ndị enweghị ọrụ ruo nde itoolu n’etiti afọ 2015 na afọ 2020 bụ okwu ziri ezi.

TheCable nyochara mbipụta afọ 2015 na afọ 2020 màkà ndi enweghị ọrụ nke ụlọ ọrụ National Statistics (NBS) nwere.

Mgbakọ ndị afọ ha danyere n’etiti iri na ise rue iri abụo na anọ, na ndị afọ ha danyere na iri abụo na ise rue iri atọ na anọ zikọrọ, na afọ 2015, na ndị ntorobịa enweghị ọrụ ruru 3.65m, 4.0m, 4.96m na 5.30m na nkeji anọ afọ n’anọ a.

Ọzọkwa, NBS bipụtara sọ̀ mgbakọ ndị ọrụ obodo na nkeji abụọ na anọ na afọ 2020. Nkeji nke abụọ dekọtara 13.98 million màkà ndị ntorobịa enweghi ọrụ. Nkeji anọ dekọtara 12.72 million.


MGBARAKWA ISII: N’ime naanị afọ ise, n’etiti 2015 na 2020, ọnụ ọgụgụ maka ọdịda ndị nwere ọrụ aka pụta pasenti ịrị ise na anọ, site na nde iri isii na asatọ ruo nde mmadụ iri atọ na otu.

IKPE: Nke a bụ okwu adịgboroja. Onweghị mgbe ọnụ ọgụgụ ndị na rụ ọrụ na Naijiria jiri ruo nde iri isii na asatọ na afọ 2015, dabere na mbiputa ụlọ ọrụ NBS mèrè.

NBS zikọrọ na ndị mmadụ karịrị 23.1 million site na mkpokọta ndị oru nke 69.6 million enweghị ọrụ na nkeji ikpeazụ n’afọ 2020.

Mgbakọ nke e nwetere na NBS zikọrọ na ọnụ ọgụgụ niile ndị Naijiria na-arụ ọrụ na nkeji izizi n’afọ 2015 bụ 55.69 million; nkeji abuo bụ 54.37 million; nkeji atọ bụ 55.21million, nkeji anọ bụ 54.50 million.

Ka ọ dị ugbu a, na afọ 2020, NBS bipụtara mgbakọ ike ọrụ na nkeji abụọ na anọ. Mgbakọ ndị Naijiria na-arụ ọrụ na nkeji abụọ bụ 35.5 million. Nke nkeji anọ pụtara 30.57 million.

Mgbe a tulere ọnụ ọgụgụ ndị Naijiria na-arụ ọrụ zuru okè na Naijiria na nkeji anọ n’afọ 2015 na afọ 2020, e nwere ihe dị iche nke pụtara 43.90%. Otu ntụle ahụ bụ nke nkeji abụọ n’afọ 2015 na 2020, nke zikọrọ ihe dị iche pụtara 34.55%.


MGBARAKWA NKE ASAA: Ọkụ eletrik nọ na okpuru ndepụta omebe iwu pụrụiche, exclusive legislative list.

IKPE: Okwu a abụghị nke ziri ezi. Ọkụ eletrik nọ na okpuru ndepụta omebe iwu n’otu oge, Ọ nọghị na ndepụta pụrụ iche, legislative list.

Naijiria na-eme usoro gọọmentị etiti ebe ekere ike n’usoro iwu kwadoro site na federal, state, na local kansul. Ya mere anyị nwere ndepụta omebe iwu pụrụiche, ndepụta omebe iwu n’otu oge, na ndepụta omebe iwu fọdụrụnụ.

TheCable kpọtụrụ Olusola Akinyemi, onye ọka iwu. O nyèrè nghọta banyere okwu a.

Ndepụta omebe iwu pụrụiche bụ nke federal gọọmenti. Ndepụta omebe iwu n’otu oge bụ nke edebere federal gọọmenti na state gọọmenti ime iwu n’efu. Ọ bụrụhaala na enwere esemokwu nke iwu, iwu nke federal gọọmenti na-emeri.

Add a comment

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

error: Content is protected from copying.