--Advertisement--

Íhé Tinubu nà Shettima kwùrù màkà àkụ̀ nà ụ̀bá Lagos ọ̀ bụ̀ ézíókwu?

Bola Tinubu and Kashim Shettima Bola Tinubu and Kashim Shettima

Kashim Shettima, òsòté Bola Tinubu, onye All Progressive Congres (APC) họpụtara màkà ntụlị aka nke 2023, kwùrù sị na akụ na ụba Lagos state bụ̀ nke atọ kachasị ukwu na Afrịka.

Nya bụ onye bụbu gọvanọ Borno steeti nọchiri anya Tinubu n’ụbọchị Monde n’ọgbakọ izugbe nke ndị Nigerian Bar Association (NBA) na-eme afọ ọbula.

Shettima kọwara ihe ọ sị patara na Tinubu pụrụ iche n’etiti ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị ọzọ.

Ọ sị na Lagos steeti bù akụ na ụba nke atọ kachasị ukwu na Afrịka.

Advertisement

Shettima kwùrù sị́: “Oge Asiwaju Bola Ahmed Tinubu bụ gọvanọ Lagos n’afo 1999, sọ ótù ụgbọ ihe mberede kà Lagos steeti gọọmenti nwèrè. Lagos na-akpata narị nde asaa nke bụ ego ha na-enwete n’onwe ha.

“Ugbua, Lagos na-akpata ijeri iri ise na ótù na onwa ọbụla. Lagos bù akụ na ụba nke atọ kachasị úkwú na Afrịka.”

Nke a abụghị ìzìzì Shettima ga-ekwu udiri okwu a.

Onyonyoo gósírí ebe ọ na-ekwu nya bụ okwu pụtara na mgbasa ozi ọha. Onye bu ụzọ tinye onyonyo a na Twitter bụ @progressive4BAT, akaụntụ Twitter nke na-akwado Tinubu.

Advertisement

Ndị lere onyonyo a rùrù otu narị puku na iri atọ.

Ụbọchị isii n’ọnwa Ọgọstụ, ndị mmadụ tinyere onyonyo ahụ na Twitter. Ótù onye tinyere ya bụ Festus Keyamo, minister of state for labour and employment, onye bụkwa onye na-ekwuchitere ọnụ APC kansul màkà ndọrọ ndọrọ ọchịchị.

Ihe ọ dere na onyonyo ahụ kwùrù sị: “Í kwùrù nke ọma, onye ísi.”

Advertisement

TINUBU KPỌ̀RỌ̀ LAGOS OBODO NWERE AKỤ NA ỤBA KACHASỊ ÚKWÚ NA AFRỊKA

N’ọnwa Eprel, na afọ 2022, Tinubu gàrà ị́hụ mmadụ ìrí na ìsé APC na-ekwuchitere state assembly n’ọgbakọ Lagos steeti hàzìrì.

Advertisement

Na akụkọ Daily Trust bipụtara, Tinubu, oge o na-ekwu màkà onwe ya m̀gbè ha ka na-eme presidential primaries nke APC, kwùrù sị na o nyere áká méé ka Lagos bụrụ steeti akụ na ụba ya kachasị úkwú na Afrịka.

O kwuru sị: “A zulitere m ka m bụrụ onye na anaghị atụ égwù. Nke a na-agara m. Site na òkè efu nke anyị na-enweta mgbe ahụ n’aka FAAC, a tugharịrị m Lagos steeti. Taa, steeti a bụ nke ka nwe akụ na ụba na Afrịka. Mmụnwa nwere ike ime ọnụ. A chọrọ m ime ihe dị otu a ma m bụrụ onye isi Naijiria.”

Advertisement

Lagos èwètèrè òkè efu na akaụntụ federal gọọmenti bido n’afọ 1999 ruo afọ 2006?

Ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị APC, Shettima na Tinubu, ènwètèrè ihe ha kwụrụ màkà akụ na ụba Lagos?

Nke bụ ihe anyị chọpụtara.

LAGOS ÈNWÈTÈRÈ ÒKÈ EFU SITE NA GỌỌMENTI ETITI OGE TINUBU BỤ GỌVANỌ?

Ubọchị Satode, iri abụo na asaa n’ọnwa Maachị na afọ 2004, ndị Lagos steeti mere ntụlị aka imepụta LGA iri ise na asaa.

Steeti ndị ọzọ so Lagos wéé mepụta LGA ọhụrụ oge ahụ bụ Ebonyi, Katsina, Nasarawa na Niger.

Onye bụ bu onye ịsị obodo, Olusegun Obasanjo, gwara steeti na edemede o dere  si na onweghị ego gọọmenti etiti ga-enye LGA ọhụrụ ha mepụtara.

Ka okwuru nke a, steeti ndị ọzọ naghachiri ka ha si dị. Sọ̀ Lagos sị na ha ga-ekpe ikpe.

Ka ha kpechárá ikpe, ụlọ ikpe kachasiri kwùrù na onye isi Naijiria enweghị ike íjichi ego ekwesiri inye LGA iri abụọ. Ụlọ ikpe nyere onye isi Naijiria ntụziaka ka o nye ha bụ ndị LGA ọhụrụ ego ha, mana omeghị ya.

Gọọmenti etiti mèchàrà jichie nya bụ ego ruo mgbe ọchịchị Tinubu na Obasanjo bìrì.

Ka Umar Musa Yar’Adua banyere ọchịchị, o mechara nye LGA ndị ọhụrụ a ego ahụ.

TheCable kpọtụrụ Musa Yusuf, Onye bụbu onye isi Lagos Chamber of Commerce and Industry (LCCI), i chọpụta ma Lagos state ènwètèrè òkè efu ka Tinubu sìrì kọwaa.

Ọ sị na òkè efu bụ màkà LGA ọhụrụ e mepụtara, na ọbụghị maka Lagos steeti.

IKPE

Onweghị mgbe gọọmenti etiti kwụsịrị ịnye Lagos steeti òkè ego ruru ha. Sọ ego LGA ọhụrụ bụ ihe ha kwụsịtụrụ inye bido na afọ 2004 ruo 2007. Mgbarakwa na Lagos steeti nwetere òkè efu bụ okwu adịgboroja.

IGR LAGOS STATE Ò RÙRÙ NARỊ NDE NDE ASAA na AFỌ 1999 DỊKA SHETTIMA KWÙRÙ?

Anyị chọpụtara na ihe Shettima kwùrù abụghị eziokwu.

Ihe ụlọ akụ étíti, CBN, dere màkà yá na Research Academy of Social Sciences nke dị na Lagos zikọrọ na Lagos nwetere ihe ji obere ihe karịa ijeri naira iri na anọ na afọ 1999.

Ka Tinubu hapụrụ oche onye isi, IGR Lagos steeti gbagoro obere ihe karịa ijeri narị iri asatọ na atọ.

Ihe National Bureau of Statistics (NBS) dere màkà IGR nso nso a n’akụkọ ọkara afọ 2021 ya zikoro na Lagos mepụtara ijeri naira narị abụọ na iri isii na asaa n’onwa isii mbụ.

IKPE

IGR Lagos elughị ihe Tinubu na Shettima kwụrụ. Mgbarakwa abụọ a bụ okwu adịgboroja.

Ọ̀ BỤ̀ AKỤ NA ỤBA LAGOS STEETI BỤ NKE ATỌ KACHASỊ ÚKWÚ NA AFRỊKA?

TheCable nyochara ihe Shettima na Tinubu kwùrù gbasara akụ na uba Lagos.

Muda Yusuf, onye bụbu director general LCCI, sị na GDP bụ ihe ntukwasị anya e ji ama ka akụ na ụba hà.

“GDP per capita nke na-ekewa GDP site na ọnụ ọgụgụ bụ òtú ọzọ eji ama ka akụ na uba hà maka ọ na-eziko ọdịmma ndị mmadụ”, ihe a bụ ihe o kwùrù.

Lagos enweghị ego òtú ndị mmadụ sì échè maka íbú ọrụ ha nwere dị̀ úkwú.

N’afo 2020, Lagos Bureau of Statistics (LBS) họọrọ obodo Afrịka dịka nke ka nwé ego site na GDP na dollars.

Lagos nwere GDP ijeri dollar naira iri asaa na isii. Ọ bụ nke anọ. Cairo nwèrè GDP ijeri dollar narị abụọ na iri na abụọ, nke mere ha jiri bụ obodo kachasị nwe akụ na uba na Afrika.

Obodo na-eso ha bụ Johannesburg. GDP ha bụ otu ijeri dollar na iri atọ na otu. Ọzọ kwa na-eso ya bụ Cape Town. GDP ya bụ ótù narị na iri abụọ na ótù ijeri dollar.

Ọ BỤRỤ NA LAGOS BỤ OBODO

N’agbanyeghị na akụ n’ụba Lagos pere mpe iji tulee nke obodo ndị úkwú nọ na Afrịka, ọtụtụ mmadụ na-ejikarị GDP ya agbakọ nke ndị ọzọ, dịka Lagos abụ obodo n’onwe ya.

N’ime akụkọ ya na afọ 2021, LBS kpughere na GDP Lagos karịrị trillion iri abụọ na isii.

TheCable ji data 2021 weere tulee Lagos na obodo ndi ọzọ dị na Afrịka.

S/N Country GDP USD billion
1. Nigeria $440.7 billion
2. South Africa $419.9 billion
3. Egypt $404.1 billion
4. Algeria $167.9 billion
5. Ethiopia $111.2 billion
6. Kenya $110.3 billion
7. Ghana $77.5 billion
8. Angola $72.5 billion
9. Cote d’Ivoire $69.7 billion
10. Tanzania $67.7 billion
11. Lagos  $61.9 billion (Official rate)
12. Congo $53.9billion
13. Cameroon $45.2 billion
14. Uganda $40.4billion
15. Lagos $38.4 billion (Parallel market)
16. Sudan $34.3 billion
17. Senegal $27.6 billion

Iji ọnụego mgbanwe gọọmentị wee tụgharịa GDP nke LBS na NBS weputara, Lagos nọ n’ọkwa iri na ótù na Afrịka. Ha bụ iri na isii site na ọnụ ahịa ahịa yiri ya.

IKPE

Lagos enweghị akụ na ụba nke atọ kachasị úkwú na Afrịka. O nweghị akụ na ụba nke kachasị úkwú na Afrịka dịka Shettima na Tinubu si kwuo.

Lagos gọọmenti n’onwe ya kwere na ọ́kwá nya bụ steeti bụ̀ nke anọ n’etiti nnukwu akụ na uba dị na Afrịka.

Add a comment

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

error: Content is protected from copying.