Advertisement
CHECK AM FOR WAZOBIA

Ọ̀ bụ́ghị Victor Osimhen jì táyà nà ágbụ́ ígwè èmé ọ̀zụ̀zụ̀ n’ònyònyó à

BY Janefrances Chibundu

Share

Victor Osimhen bụ̀ ótù n’ime ndị na-agbara Nigeria bọọlụ n’asọmpi Africa Cup of Nations (AFCON) nà Ivory Coast.

N’agbanyeghị nà ọ́ bụ̀ naanị ótù ọ̀kpụ̀ goolu kà ọ satabere n’ime asọmpi anọ há nwegoro, ó nyele aka n’ụzọ pụrụ iche inye òtù Super Eagles mmeri ha.

Ọ bụ nnukwu enyemaka nye òtù ya nke pụtara ihe ọfụma, ọkachasị mgbe òtù bọọlụ ya lọghachitara ezumike n’asompi n’etiti ha na Cameroon, ebe ọ gbàrà Eagles úmé ịsata ọkpụ goolu abụọ nke ndị òtù Indomitable Lions nke Cameroon asataghị ihe ọbụla.

Ọ̀kụ́ bọọlụ à dị naanị afọ iri abụọ n’ise bụ ihe mmekpa ahụ nye nchekwa òtù bọọlụ mba Cameroon, ebe ó jisiri ike ghara ikwe kà há sata ọkpụ goolu ọbụla, nke mere kà Naijiria merie Cameroon.

Advertisement

Ónyé à bụkwa onye ọkụ bọọlụ mba Africa nke afọ 2024 nyere Ademola Lookman aka o jiri sata ọkpụ goolu mbụ ọ́ satara.

Kà o gosịchara ihe ndịa na asọmpi ndịa, ọtụtụ nwa afọ ala Naijiria na soshal media ekesaala ihe ngosị ebe onye yiri Osimhen na-agabiga óké ọzụzụ.

N’ihe ngosị ahụ nke a hụtara ọtụtụ ebe nille na soshal media, ka onye a nọ n’ime ihe ngosị ahụ yiri Osimhen jì táyà, ìgwè chain na bụ̀lọ́kụ̀ eme ọ́zụ̀zụ̀.

Advertisement
Advertisement

“Ị̀ chọ̀rọ̀ ịma ihe Osinhem ji egosị udi ike ọ na-egosị n’asompi AFCON? Lee ótú o si ázụ̀ onwe ya,” Nkirukamma na X dere n’edemede sochiri nya bụ ihe ngosị.”

Ihe ngosị a enweta ihe nkiri karịrị puku narị abụ n’iri itoolu n’otu (291,00) nya na ńkwàdó na nkesa karịrị puku na X (nke a mara mbụ dịka Twitter).

E biputala ihe ngosị a n’ọtụtụ asafe, ma kesaa ya ọtụtụ oge n’ọba ozi Whatsapp.

Advertisement

Ị́KỌWA ḾGBÁGWÒJÙÁNYÁ À

TheCable nyochara ebe nkesa nya bụ ihe ngosị bidiro, ma chọpụta na ọ bụ Ebubu David, otu onye na-ebipụta okwu na soshal midia, bipụtara nya bụ ihe ngosị na X.

Advertisement

David bụ onye nọ n’ihe nkiri ahụ ji agbụ ígwè na táyà mebiri emebi azụ onwe. O nwere ndị na-eso ya ruru ótù narị na iri n’itoolu (190,00) n’ọba ozi TikTok. Á mara ya ọfụma dịka onye na-ejije Osimhen.

O bipụtara nya bụ ihe nkiri n’ụbọchị iri na atọ nke ọnwa Decemba n’afọ 2023, ma dee sị na “Victor Osimhen gbara mbọ iru ebe ọ nọ̀ taa. I nwèrè ike ime ya n’onwe gị”.

@osimhenjnr_9

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Onye nọ n’ihe nkiri ahụ abụghị Victor Osimhen. Kama, ọ bụ Ebube David. Okwu nà ọ bụ Osimhen nọ n’ihe nkiri ahụ bụ asị.

This website uses cookies.