Advertisement

Ónyé ísíàlà ọ́hụ́rụ Senegal ọ̀ kọ́tọ̀rọ̀ France n’ímé íhé ńkírí na-ewù èwù

Ọ bụrụ na ị na-eso ihe na-eme na soshal midia nke ọma n’izu ụka abụọ gara-aga, o nwere ike bụrụ na ị kiriela ihe ngosị ebe Bassirou Diomaye Faye nke mba Senegal na-akọtọ obodo France.

Ihe ngosị a, nke gazugoro ebe niile na soshal midia nke Naijiria n’ufọdụ obodo na Afrika, bụ nke ekesara na TikTok, X (nke a maburu dịka Twitter), Facebook, LinkedIn, na WhatsApp.

“Oge eruola mgbe France ga-akwụsị imekpa obodo anyị ahụ. Ọtụtụ afọ ịchị n’ike na mmekpa ahụ ebutela óké afụfụ nye obodo anyị. Oge eruola ịkwụsị mmekpa ahụ dị ótú a,” onye a kwụrụ n’ihe ngosị ahụ.

Ọtụtụ ndị kesara nya bụ ihe ngosị na-aṅụrị na Faye, onye nọ n’ụzọ ịbụ onye ntorobịa mbụ kacha nta ịbụ onye isi àlà na Afrịka, kwụ chịm n’okwu ya ebe France nọ.

Advertisement

Ótù onye ji X ezisa ozi bụ @von_Bismack, onye nke nwere ndị nsonye karịrị otu puku (100,000), biputara ihe ngosị a n’ehihie ụbọchị Tuesday. Kámgbè e biputara nya bụ ozi, ihe ngosị ahụ enwetala narị ise (500), nkesa narị atọ na iri atọ n’atọ (333), ntụnye ọnụ iri atọ n’abụọ ya na nkiri karịrị puku iri abụọ (20,000). Pịa aka ebe a ka ị fụ ya.

“Oge eruola mgbe France ga-ahapụ Afrịka áká… …Maazi Bassirou Diomaye Faye onye bụ onye isiala ọhụrụ Senegal họpụtara. Nke a gosịrị ịda mba nke mmekpa ahụ France n’ebe Afrịka nọ,” onye a na X dere n’okpuru ihe ngosị a.

Na Facebook, O’Kay Kanayo bipụtara ihe ngosị a, ma dee sị “Afrịka etetala n’ụra, ka Chineke chekwaa onye isiala ọhụrụ mba Senegal. Ọzọ ga-abụ Nigeria n’afọ 2027. Agaghị enwezi ọchịchị ndị nrụrụ aka. Oge eruola mgbe anyị ga-esonye n’ime obodo ndị ji akụ n’ụba edu ụwa niile.”

Advertisement

Na Whatsapp, nya bụ ihe nkiri bụ nke ekesagoro ọtụtụ mgbe, nke mere ejiri dọọ ndị mmadụ aka na ntị na “ekesaala ya ọtụtụ mgbe”.

ÍNYÒCHÁ ÓKWÚ À

TheCable jiri ńgwá ọrụ Reverse Image Search nyochaa akụkụ niile dị na ihe ngosị ahụ, ma chọpụta na ọ bụ nke si n’okwu Ousmane Sonko, onye nọ n’isi ịma ọchịchị Senegal aka n’ótù nzukọ nya na ndị nta akụkọ nwere n’afọ 2021 na Dakar, Senegal.

Sonko kwuru na asụsụ French, n’abụghị na n’asụsụ bekee dịka ihe nkiri ahụ gosịrị.

Advertisement

N’ọgbakọ ahụ, nya bụ́ onye ndu ndị na-ama ọchịchị Senegal aka kwuru okwu imegide mkpebi Senegal ịnabata iwu ịnuso ndị ji egbe egbu ndị ọzọ n’obodo ha.

Ọ kọtọkwara France n’ihe ọ kpọrọ “ekweghị ka obodo há chịburu nwere onwe ha nke ọma”.

Ọgbakọ a bụ nke e kiriri ka ọ na-eme, ma bipụta ya n’asafe YouTube Senegal 7, ọba ozị mba Senegal nke bụ obodo na-asụ French. N’ime otu áwà Sonko kwuru n’ogbako ahụ, ọsuru n’asụsụ French.

O bịpụtakwara nya bụ okwu ya na n’asafe X nke edekwara na French.

Advertisement

Thecable chọpụtara na ejiri teknuzu wogharịa ólú Sonko ka ọ dịka ò kwuru n’asụsụ bekee.

Ịgbakwunye, anyị chọpụtara na ihe ngosị a na-ewu ewu, nke onye isiala ọhụrụ Senegal nọ na ya, bụ nke ebipụtagoro kámgbè afọ 2023 na YouTube.

Advertisement

ÒNWÈRÈ ÍHÉ JÍKỌ́TÁRÁ SANKO NÀ FAYE?

Sanko bụ onye ǹdú òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị Patriots of Senegal (PASTEF), òtù kwadoro Faye na ntuliaka onye isiala e mere.

Advertisement

Ọtụtụ ndị nnyocha ndọrọ-ndọrọ ọchịchị na-ekwu na ọ bụ Sanko zụpụtara Faye. Ụmụ nwoke abụọ a bụ ndị akpọchiri na nga ka a na-akwado maka ntuliaka, ma e mechara hapụ ha n’izu ụka ole n’ole tupu e me nya bụ ntuliaka.

Ụlọikpe okpechaa ọ̀gwụ́ mabidoro Sanko ịzọ ọ́kwá onye isiala, nke mere ka PASTEF họpụta Faye dịka onye ji otu ha azọ ọkwa onye isiala.

Advertisement

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

Onye nọ n’ihe nkiri ahụ na-akọtọ France abụghị Faye, onye isiala ọhụrụ ndị Senegal. Kama, ọ bụ Sanko, onye ndu òtù PASTEF.

Ihe ngosị ahụ akụgharịrị bụ nke si n’ọgbakọ Sanko na ndị nta akụkọ nwere n’afọ 2021.

Add a comment

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

error: Content is protected from copying.