Advertisement

Ụ́lọ̀ ị́kpe ékwupụ̀tàghị̀ ónyé ji LP dọ́ ọ́kwá gọ́vanọ̀ Delta dị́kà ónyé ḿmérí ńtụ̀lị́ áka

Kennedy Pela Kennedy Pela

Ótù ihe ngosị nke Hichief Sunny Odogwu, onye ji Facebook ezisa ozi, tinyere n’ọba ozi ya kwùrù sị na ụlo ikpe ntụlị aka ekwupụtala Kennedy Pela, onye ji Labour Party (LP) dọ ọkwa ọchịchị gọvanọ Delta stéétị̀, dịka onye meriri na ntụlị aka ahụ.

Ebiputara nya bụ ihe ngosị nkeji isii à n’ụbochị iri atọ nà ótù nke ọnwa August.

“Ụlọ ikpe mgbagha ekwupụtala Ken Pela, onye ji Labour Party dọ ọkwa ọchịchị gọvanọ na Delta steeti, dịka onye meriri na ntụli aka ahụ,” nke a bụ̀ ihe ísí okwu mbipụta ahụ kwuru.

Ókwú a nwetara nkiri puku iri asaa na ntunye ọnụ narị abụọ na iri isii n’isii. Ndị okwu à masịrị ruru otu puku na nari iri atọ.

Advertisement

 

Odogwu gwara ndi n’ile kirigoro nya bụ ozi ka ha kesaa ya nye ndị ọzọ.

Advertisement

ŃCHỊ́KỌ́TÁ

N’otu akụkọ TheCable bipụtara, ụlọ ikpe mgbagha bụ́ appeal court nà Abuja nyere iwu kà ndị ikpe ntụlị aka gọvanọ Delta steeti nye ohere inụta mkpebi ikpe Pela nke Labour Paty bùrù gá ụlọ ikpe.

Òtù Independent National Electoral Commission (INEC) kwuputara Sherriff Oborevwori, onye jiri Peoples Democratic Party (PDP) dọ ọkwa ọchịchị gọvanọ, dịka onye meriri na ntụlị aka nke ụbọchị iri na asatọ nke ọnwa March na steeti ahụ.

Oborevwori jiri vote puku narị atọ na iri isii na narị iri atọ n’anọ merie Ovie Omo-Agege nke APC, onye nwetara vote puku narị abụọ na narị anọ na narị abụọ n’iri abụọ n’itolu.

Advertisement

Pela bụ onye nke atọ, ma nwetakwa vote iri anọ n’asatọ na iri abụọ n’otu.

Pela na òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị ya gara n’ihu ịgbagha mpụta nya bụ ntụlị aka. Há sị na onye meriri enweghị di ikike ịzọ ọkwa ọchịchị. Há sị na onwere ọtụtụ nrụrụ aka mere na nya bụ ntụlị aka. Há kwukwara sị na odara iwu ntụlị aka ahụ n’onwe ya.

Ha gwara ụlọ ikpe ka o kwupụta Pela dịka onye mmeri na ntụli aka ahụ maọbụ kagbuo ya, mà mee ntụli aka ọhụrụ .

ḾKPÉBÌ ÚLỌ̀ ÍKPÉ ḾGBÁGHÁ

Advertisement

Tupu ụlọ ikpe ntụlị aka ègèé nchegbu há, Damian Dodo, onye isi ndụmọdụ nyere gọvanọ na osote ya, rụ̀rụ̀ aba, sị na há ahapụgo nkpesa LP.

O kwuru na há bụ ndị butere ikpe à jụrụ ịgosị onwe ha n’ụlọ ikpe n’ụbọchị asaa e mechara ntụli aka dịka há kwesịrị.

Advertisement

Dodo gbakwunyere sị na Pela na LP agaghị n’ihu ịnata ohere ọzọ íkpesa ikpe ha, nke mere ka ikpe ha bụrụ nke abazighị uru.

Dodo gara n’ihu kwuo na onye ḿkpésá à gara nata ohere ikpesa ikpe ya n’ụbọchị iri na itolu tupu emeghe ohere íkpesa ikpe, nke mere ḿkpésá ya jiri bụrụ nke bịara ọsịsọ, mà bụrụkwa nke ékwèsị̀rị̀ itufu.

Advertisement

C.H Ahuchaogu, onye isi oche ikpe ntụlị aka, nke mmadu atọ nọchiri, tufuru ḿkpésá Pela.

Pela na LP jiri iwe buru nya bụ ikpe gazie ụlọ ikpe mgbagha, nke bụ court of appeal.

Advertisement

N’ụbọchị iri atọ n’otu nke ọnwa August, ụlọ ikpe mgbagha mezuru uche obi onye ḿkpésá, ma nye iwu kà eweghachi ikpe à n’ụlọ ikpe ntụlị aka ebe ha nọbu ekpe nya bụ ikpe.

ŃCHỊ́KỌTÁ

Mbipụta nke na-akọwa nà ụlọ ikpe ekwuputala Pela dịka onye mmeri ntụlị aka ọkwa gọvanọ Delta steeti abụghị eziokwu.

Ụlọ ikpe mgbagha bụ̀ naanị iwu kà ó nyèrè iweghachi ḿkpésá Pela na LP n’ụlọ ikpe ntụlị aka mgbe TheCable dere akụkọ a.

Onwebeghị ikpe ikpeazụ e nyere gbasara ḿkpésá ya.

Add a comment

Leave a Reply

Your email address will not be published. Required fields are marked *

error: Content is protected from copying.